Job 37

1“Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji,
na-amali elu site nʼọnọdụ ya.
2Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya,
na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta.
3Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile,
ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ.
4Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya;
ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe,
mgbe olu ahụ dara dakwasị,
ọ naghị egbochi amụma igbu egbu.
5Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe;
ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.
6Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’
na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’
Ghọọ oke mmiri ozuzo

7Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya;
ọ na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ.
8Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe;
ha na-anọgide nʼebe obibi ha.
9Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa,
oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.
10Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri,
ogbu mmiri na-akpụkọtakwa.
11Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri;
na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii.
12Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu
imezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha mee
nʼelu ụwa niile.
13Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ,
na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya.

14“Job, gee ntị.
Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.
15Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii
na-eme ka amụma gbuo?
16Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe,
nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?
17Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ
mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,
18ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe
nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?

19“Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya;
ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.
20A ga-agwa ya na m nwere okwu?
Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?
21Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya
ka ọ na-achake na mbara igwe,
mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.
22Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta;
Maọbụ, nʼugwu ka ọ si na-abịa ka ebube ọlaedo

Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.
23Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu,
nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ.
24Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya,
ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”
Ma ọ dịghị agụnye ndị niile na-eche na ha maara ihe.

Copyright information for IboBIU